2 Ndị Eze 2

Mgbe ahụ, Ịlaịja chịịrị uwe mwụda ya, pịakọtaa ya, tie ya nʼelu osimiri ahụ. Mmiri ahụ kewara ụzọ abụọ, ala akọrọ pụtakwara. Nʼebe ahụ ka Ịlaịja na Ịlaisha si gafee nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ.

2 Kings 2:8 (UKJV) And Elijah took his mantle, and wrapped it together, and stroke the waters, and they were divided here and thither, so that they two went over on dry ground.

6Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ka m jee Jọdan.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro na-eje.

7Iri ndị amụma ise sitere nʼetiti ndị amụma sooro ha guzoro nʼebe dị anya na ncherita ihu ebe Ịlaịja na Ịlaisha kwụsịrị nʼakụkụ Jọdan.

8Mgbe ahụ, Ịlaịja chịịrị uwe mwụda ya, pịakọtaa ya, tie ya nʼelu osimiri ahụ. Mmiri ahụ kewara ụzọ abụọ, ala akọrọ pụtakwara. Nʼebe ahụ ka Ịlaịja na Ịlaisha si gafee nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ.

9Mgbe ha abụọ gafesịrị, Ịlaịja jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị tupu e site nʼebe ị nọ wepụ m?” Ịlaisha rịọrọ sị ya, “Biko, mee ka m nweta ụdị mmụọ i nwere okpukpu abụọ.”

10Ịlaịja zara sị ya, “Ihe ị rịọrọ bụ ihe sịrị ike omume. Ọ bụrụ na ị hụ m mgbe a na-ewepụ m site nʼebe ị nọ, ị ga-enweta ihe ị rịọrọ. Ma ọ bụrụ na ị hụghị m, ị gaghị enweta ihe ị rịọrọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.