2 Ndị Eze 23

Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya na ndị ikom Juda niile, ndị niile bi na Jerusalem, na ndị nchụaja, na ndị amụma niile, na ndị mmadụ niile, site nʼonye nta ruo na onye ukwu. Ọ gụpụtara na ntị onye ọbụla okwu niile si nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke achọtara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.

2 Kings 23:2 (UKJV) And the king went up into the house of the LORD, and all the men of Judah and all the inhabitants of Jerusalem with him, and the priests, and the prophets, and all the people, both small and great: and he read in their ears all the words of the book of the covenant which was found in the house of the LORD.

1Mgbe ahụ, eze zigara ozi kpọkọta ndị okenye Juda na Jerusalem.

2Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya na ndị ikom Juda niile, ndị niile bi na Jerusalem, na ndị nchụaja, na ndị amụma niile, na ndị mmadụ niile, site nʼonye nta ruo na onye ukwu. Ọ gụpụtara na ntị onye ọbụla okwu niile si nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke achọtara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.

3Eze guzoro nʼakụkụ ogidi, kwee nkwa nʼihu Onyenwe anyị, ịgbaso Onyenwe anyị, na iji obi ya niile, na mkpụrụobi ya niile, debe ihe niile o nyere nʼiwu, nʼihe ama ya niile na ụkpụrụ ya niile. O si otu a mee ka okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ e dere nʼakwụkwọ guzosie ike. Mgbe ahụ, ndị mmadụ niile kwekwara nkwa idebe ọgbụgba ndụ ahụ.

4Eze nyere Hilkaya onyeisi nchụaja na ndị nchụaja na-esote nʼọkwa, na ndị na-eche ọnụ ụzọ mbata, iwu ka ha site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị kwapụtasịa ngwongwo niile e mere nye Baal, na Ashera, na usuu ihe niile nke mbara eluigwe. O sunyere ha niile ọkụ nʼazụ Jerusalem, nʼọhịa dị na Ndagwurugwu Kidrọn, buru ntụ ha bulaa Betel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.