2 Ndị Eze 23

O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ndị eze buru ya ụzọ.

2 Kings 23:32 (UKJV) And he did that which was evil in the sight of the LORD, according to all that his fathers had done.

30Ndị na-ejere Josaya ozi sị na Megido buru ozu ya nʼime ụgbọ agha bulata ya na Jerusalem, lie ya nʼili nke aka ya. Ndị ala ahụ kpọọrọ Jehoahaz nwa nwoke Josaya, tee ya mmanụ, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya.

31Jehoahaz gbara iri afọ abụọ na atọ mgbe o bidoro ịchị, ma ọ chịrị na Jerusalem ọnwa atọ. Aha nne ya bụ Hamutal, nwa Jeremaya onye Libna.

32O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ndị eze buru ya ụzọ.

33Ma Fero Neko keere ya agbụ na Ribla nʼala Hamat, ime ka ọ ghara ịchịkwa na Jerusalem. Neko kwagidere ndị Juda ka ha tụọrọ ya ụtụ narị talenti ọlaọcha, na otu talenti ọlaedo.

34Fero Neko mere Eliakịm nwa nwoke Josaya, eze, nʼọnọdụ Josaya bụ nna ya. Ọ gụgharịrị aha Eliakịm ka ọ bụrụ Jehoiakim. Ma o duuru Jehoahaz gaa Ijipt, ebe ọ nọ nwụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.