32O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ndị eze buru ya ụzọ.
33Ma Fero Neko keere ya agbụ na Ribla nʼala Hamat, ime ka ọ ghara ịchịkwa na Jerusalem. Neko kwagidere ndị Juda ka ha tụọrọ ya ụtụ narị talenti ọlaọcha, na otu talenti ọlaedo.
34Fero Neko mere Eliakịm nwa nwoke Josaya, eze, nʼọnọdụ Josaya bụ nna ya. Ọ gụgharịrị aha Eliakịm ka ọ bụrụ Jehoiakim. Ma o duuru Jehoahaz gaa Ijipt, ebe ọ nọ nwụọ.
35Jehoiakim kwụrụ Fero Neko ọlaọcha na ọlaedo ahụ ọ nara nʼaka ya. Ka o nwee ike mee nke a, o kere ụtụ nʼala ahụ, werekwa ike nara ndị ala ahụ ọlaọcha na ọlaedo, dịka mkpebi ha si dị banyere ihe onye ahụ ga-akwụ.
36Jehoiakim gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zebida nwa Pedaya, onye Ruma.