2 Ndị Eze 23

Ọ chụdara ndị nchụaja arụsị ndị ahụ niile, bụ ndị eze Juda họpụtara isure ihe na-esi isi ụtọ nʼelu ebe dị elu nke obodo Juda nakwa ebe dị ọkụ. Nʼihi na ndị nchụaja ndị a achụọla aja, surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu niile dị nʼobodo dị iche iche na Juda, nakwa ndị dị gburugburu Jerusalem. Ha bụ ndị surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, na anyanwụ, ọnwa na kpakpando, nyekwa usuu niile nke mbara eluigwe.

2 Kings 23:5 (UKJV) And he put down the idolatrous priests, whom the kings of Judah had ordained to burn incense in the high places in the cities of Judah, and in the places round about Jerusalem; them also that burned incense unto Baal, to the sun, and to the moon, and to the planets, and to all the host of heaven.

3Eze guzoro nʼakụkụ ogidi, kwee nkwa nʼihu Onyenwe anyị, ịgbaso Onyenwe anyị, na iji obi ya niile, na mkpụrụobi ya niile, debe ihe niile o nyere nʼiwu, nʼihe ama ya niile na ụkpụrụ ya niile. O si otu a mee ka okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ e dere nʼakwụkwọ guzosie ike. Mgbe ahụ, ndị mmadụ niile kwekwara nkwa idebe ọgbụgba ndụ ahụ.

4Eze nyere Hilkaya onyeisi nchụaja na ndị nchụaja na-esote nʼọkwa, na ndị na-eche ọnụ ụzọ mbata, iwu ka ha site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị kwapụtasịa ngwongwo niile e mere nye Baal, na Ashera, na usuu ihe niile nke mbara eluigwe. O sunyere ha niile ọkụ nʼazụ Jerusalem, nʼọhịa dị na Ndagwurugwu Kidrọn, buru ntụ ha bulaa Betel.

5Ọ chụdara ndị nchụaja arụsị ndị ahụ niile, bụ ndị eze Juda họpụtara isure ihe na-esi isi ụtọ nʼelu ebe dị elu nke obodo Juda nakwa ebe dị ọkụ. Nʼihi na ndị nchụaja ndị a achụọla aja, surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu niile dị nʼobodo dị iche iche na Juda, nakwa ndị dị gburugburu Jerusalem. Ha bụ ndị surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, na anyanwụ, ọnwa na kpakpando, nyekwa usuu niile nke mbara eluigwe.

6O sikwa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ ogidi chi Ashera, wezuga ya nʼazụ Jerusalem, na Ndagwurugwu Kidrọn. Ebe ahụ ka ọ nọ suo ya ọkụ, supịa ya ka ọ ghọọ ntụ, fesaa ya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efu.

7Ọ kwadakwara ụlọ obibi ụmụ ndị ikom na-agba akwụna dị nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼebe ndị inyom na-anọ na-akpara Ashera akwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.