17O mere nwanne nna Jehoiakin, bụ Matanaya, eze nʼọnọdụ ya. Ọ gụgharịrị ya aha, kpọọ ya Zedekaya.
18Iri afọ abụọ na otu ka Zedekaya gbara mgbe ọ malitere ịbụ eze nʼime Jerusalem. Aha nne ya bụ Hamutal, nwa Jeremaya onye Libna. Ọ chịrị dịka eze na Jerusalem afọ iri na otu.
19Ma o mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jehoiakim mere.
20Ọ bụ nʼihi iwe Onyenwe anyị ka ihe ndị a niile ji bịakwasị Jerusalem na Juda. Nʼikpeazụ, o sitere nʼihu ya chụpụ ha. Nʼoge a, Zedekaya nupuru isi nʼokpuru eze Babilọn.