5Akụkọ ọzọ niile gbasara ọchịchị Jehoiakim na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼụbọchị ndụ ndị eze Juda?
6Jehoiakim sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Jehoiakin nwa ya ghọrọ eze ọhụrụ nʼọnọdụ ya.
7Ma eze Ijipt esiteghị nʼala ya pụta ọzọ, nʼihi na eze Babilọn nọchiri oke ala ya niile, site na mmiri iyi Ijipt ruo nʼoke Osimiri Yufretis.
8Jehoiakin gbara afọ iri na asatọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị naanị ọnwa atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Nehushta, nwa Elnatan, onye Jerusalem.
9O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna ya ha mere.