2 Ndị Eze 25

Ndị agha Kaldịa niile bụ ndị nọ nʼokpuru onyeisi ndị nche eze kwaturu mgbidi niile gbara Jerusalem gburugburu.

2 Kings 25:10 (UKJV) And all the army of the Chaldees, that were with the captain of the guard, brake down the walls of Jerusalem round about.

8Nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke ise nke afọ iri na itoolu nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche, onyeisi nʼọrụ eze Babilọn, bịarutere Jerusalem.

9O sunyere ụlọnsọ Onyenwe anyị ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ

10Ndị agha Kaldịa niile bụ ndị nọ nʼokpuru onyeisi ndị nche eze kwaturu mgbidi niile gbara Jerusalem gburugburu.

11Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, buuru ụfọdụ mmadụ ndị fọdụrụ nʼobodo, na ndị niile fọdụkwara, ha na ndị ọzọ ahụ ji aka ha gbakwuru eze bulaa ha Babilọn, ka ha ga biri nʼala ọzọ.

12Ma ọchịagha ahụ, hapụrụ ụfọdụ na ndị ahụ bụ nnọọ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ka ha na-elekọta ubi vaịnị niile a gbara ogige na ala ubi niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.