2 Ndị Eze 25

O sunyere ụlọnsọ Onyenwe anyị ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ

2 Kings 25:9 (UKJV) And he burnt the house of the LORD, and the king's house, and all the houses of Jerusalem, and every great man's house burnt he with fire.

7Ha gburu ụmụ ndị ikom Zedekaya nʼihu ya. Ha ghụpụrụ anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya gaa Babilọn.

8Nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke ise nke afọ iri na itoolu nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche, onyeisi nʼọrụ eze Babilọn, bịarutere Jerusalem.

9O sunyere ụlọnsọ Onyenwe anyị ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ

10Ndị agha Kaldịa niile bụ ndị nọ nʼokpuru onyeisi ndị nche eze kwaturu mgbidi niile gbara Jerusalem gburugburu.

11Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, buuru ụfọdụ mmadụ ndị fọdụrụ nʼobodo, na ndị niile fọdụkwara, ha na ndị ọzọ ahụ ji aka ha gbakwuru eze bulaa ha Babilọn, ka ha ga biri nʼala ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.