2 Ndị Eze 25

Ha gburu ụmụ ndị ikom Zedekaya nʼihu ya. Ha ghụpụrụ anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya gaa Babilọn.

2 Kings 25:7 (UKJV) And they slew the sons of Zedekiah before his eyes, and put out the eyes of Zedekiah, and bound him with fetters of brass, and carried him to Babylon.

5Ma ndị agha Kaldịa chụsoro eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya,

6e jide ya. Ha kpụgara ya eze Babilọn, nʼobodo Ribla, ebe a nọ maa ya ikpe.

7Ha gburu ụmụ ndị ikom Zedekaya nʼihu ya. Ha ghụpụrụ anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya gaa Babilọn.

8Nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke ise nke afọ iri na itoolu nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche, onyeisi nʼọrụ eze Babilọn, bịarutere Jerusalem.

9O sunyere ụlọnsọ Onyenwe anyị ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.