13Ma ndị Babilọn tipịara ogidi bronz niile, ha na ihe ndọkwasị niile na oke osimiri bronz ndị ahụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, buru bronz ndị ahụ bulaa Babilọn.
14Ha chịkọọrọ ite niile, na shọvel niile, na ihe ịkpakepụ ọkụ, na ngaji ukwu niile na ngwa bronz niile nke e ji eje ozi nʼime ụlọnsọ ahụ.
15Ọchịagha ndị nche eze, chịrị ihe ịgụnye ọkụ niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ya bụ ihe ndị ahụ niile e ji ọlaedo a nụchara anụcha maọbụ ọlaọcha kpụọ.
16O bukwara bronz sitere nʼogidi abụọ ahụ, oke Osimiri ahụ na ihe ndọkwasị ya niile, nke eze bụ Solomọn mere nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha karịrị ihe a ga-eji ihe ọtụtụ tụọ.
17Ị dị elu nke otu nʼime ogidi abụọ ndị a bụ mita asatọ na ụma nʼọtụtụ. Isi bronz nke e kpukwasịrị nʼotu ogidi dị otu mita na ọkara nʼịdị elu. Ọ bụkwa ihe yiri mkpụrụ pomegranet e ji bronz kpaa, ka e ji chọọ ya mma gburugburu ya niile. Ogidi nke abụọ nwekwara pomegranet, yiri ibe ya.