14Ha chịkọọrọ ite niile, na shọvel niile, na ihe ịkpakepụ ọkụ, na ngaji ukwu niile na ngwa bronz niile nke e ji eje ozi nʼime ụlọnsọ ahụ.
15Ọchịagha ndị nche eze, chịrị ihe ịgụnye ọkụ niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ya bụ ihe ndị ahụ niile e ji ọlaedo a nụchara anụcha maọbụ ọlaọcha kpụọ.
16O bukwara bronz sitere nʼogidi abụọ ahụ, oke Osimiri ahụ na ihe ndọkwasị ya niile, nke eze bụ Solomọn mere nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha karịrị ihe a ga-eji ihe ọtụtụ tụọ.
17Ị dị elu nke otu nʼime ogidi abụọ ndị a bụ mita asatọ na ụma nʼọtụtụ. Isi bronz nke e kpukwasịrị nʼotu ogidi dị otu mita na ọkara nʼịdị elu. Ọ bụkwa ihe yiri mkpụrụ pomegranet e ji bronz kpaa, ka e ji chọọ ya mma gburugburu ya niile. Ogidi nke abụọ nwekwara pomegranet, yiri ibe ya.
18Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata.