18Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata.
19O sitere nʼetiti ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo kpụụrụ otu onyeisi na-ahụ maka ndị agha, na ndị ikom ise na-enye eze ndụmọdụ. O kpukwaara ode akwụkwọ, onye isi ọrụ na-ahụ maka ịmanye ndị ga-aga agha, jidekwa iri ndị ikom isii ndị ọrụ mmanye, ndị a hụrụ nʼime obodo ahụ.
20Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla.
21Nʼebe ahụ, na Ribla dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile. Ya mere, a dọọrọ Juda nʼagha, mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ.
22Emesịa, Nebukadneza eze Babilọn họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa nwa Shefan, ka ọ bụrụ onye na-elekọta ndị fọdụrụ na Juda,