20Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla.
21Nʼebe ahụ, na Ribla dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile. Ya mere, a dọọrọ Juda nʼagha, mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ.
22Emesịa, Nebukadneza eze Babilọn họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa nwa Shefan, ka ọ bụrụ onye na-elekọta ndị fọdụrụ na Juda,
23Mgbe ndịisi agha na ndị ikom ha nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya onye na-achị ala ahụ, ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ, Ishmel nwa Netanaya, Johanan nwa Kariya, Seraya nwa Tanhumet, onye Netofa, na Jaazanaya nwa onye Maaka, na ndị ikom ha.
24Gedaliya ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha, sị, “Unu atụla egwu nʼihi ndịisi ọrụ Babilọn. Birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma.”