2 Ndị Eze 3

Jehoram nwa Ehab, malitere ịbụ eze ndị Izrel na Sameria nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Jehoshafat na Juda. Afọ iri na abụọ ka ọ chịrị dịka eze.

2 Kings 3:1 (UKJV) Now Jehoram the son of Ahab began to reign over Israel in Samaria the eighteenth year of Jehoshaphat king of Judah, and reigned twelve years.

1Jehoram nwa Ehab, malitere ịbụ eze ndị Izrel na Sameria nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Jehoshafat na Juda. Afọ iri na abụọ ka ọ chịrị dịka eze.

2O mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị, ma ọ bụghị dịka nna ya na nne ya mere. O wezugara nkume ahụ e doro nsọ nye Baal nke nna ya kpụrụ.

3Otu ọ dị, ọ nọgidere na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye mere ka Izrel baa nʼime mmehie ife arụsị. Joram esiteghị na ha wezuga onwe ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.