2 Ndị Eze 3

O mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị, ma ọ bụghị dịka nna ya na nne ya mere. O wezugara nkume ahụ e doro nsọ nye Baal nke nna ya kpụrụ.

2 Kings 3:2 (UKJV) And he wrought evil in the sight of the LORD; but not like his father, and like his mother: for he put away the image of Baal that his father had made.

1Jehoram nwa Ehab, malitere ịbụ eze ndị Izrel na Sameria nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Jehoshafat na Juda. Afọ iri na abụọ ka ọ chịrị dịka eze.

2O mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị, ma ọ bụghị dịka nna ya na nne ya mere. O wezugara nkume ahụ e doro nsọ nye Baal nke nna ya kpụrụ.

3Otu ọ dị, ọ nọgidere na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye mere ka Izrel baa nʼime mmehie ife arụsị. Joram esiteghị na ha wezuga onwe ya.

4Eze ndị Moab, bụ Misha, na ndị ya, bụ ndị na-azụ atụrụ. Nʼafọ niile, ọ na-atụrụ eze Izrel otu narị puku ajị ebule, na otu narị puku atụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.