2 Ndị Eze 3

Eze ndị Moab, bụ Misha, na ndị ya, bụ ndị na-azụ atụrụ. Nʼafọ niile, ọ na-atụrụ eze Izrel otu narị puku ajị ebule, na otu narị puku atụrụ.

2 Kings 3:4 (UKJV) And Mesha king of Moab was a sheep breeder, and rendered unto the king of Israel an hundred thousand lambs, and an hundred thousand rams, with the wool.

2O mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị, ma ọ bụghị dịka nna ya na nne ya mere. O wezugara nkume ahụ e doro nsọ nye Baal nke nna ya kpụrụ.

3Otu ọ dị, ọ nọgidere na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye mere ka Izrel baa nʼime mmehie ife arụsị. Joram esiteghị na ha wezuga onwe ya.

4Eze ndị Moab, bụ Misha, na ndị ya, bụ ndị na-azụ atụrụ. Nʼafọ niile, ọ na-atụrụ eze Izrel otu narị puku ajị ebule, na otu narị puku atụrụ.

5Ma mgbe Ehab eze Izrel nwụrụ, eze Moab nupuru isi megide eze Izrel, jụkwa ịnọ nʼokpuru ya ọzọ.

6Ya mere, eze Joram sitere na Sameria pụọ ga kpọkọta ndị Izrel niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.