19Unu ga-etigbu obodo ọbụla e wusiri ike, na obodo ukwu niile. Unu ga-egbudakwa ezi osisi ha na-amị mkpụrụ, kpọchie isi mmiri ha niile, werekwa nkume mebikwaa ezi ala ubi ha niile.”
20O ruo, nʼụtụtụ, nʼoge e ji achụ aja nsure ọkụ ụtụtụ, lee na mmiri sitere ụzọ Edọm sọọrọ bịa nʼebe ahụ ha gwuru olulu na ndagwurugwu ala ahụ sọjuo ala ahụ niile.
21Mgbe ndị Moab nụrụ na ndị eze ahụ na-abịa imegide ha, ha kpọkọtara ndị ikom ọbụla nwere ike ịlụ agha, ma okenye ma okorobịa, pụta bịa guzo nʼoke ala ha.
22Mgbe chi bọrọ nʼisi ụtụtụ, anyanwụ wara mụkwasị mmiri ahụ. Site nʼebe ha nọ, ndị Moab lepụrụ anya hụ mmiri ahụ ka ọ na-acha ọbara ọbara.
23Mgbe ahụ, ha sịrịtara onwe ha, “Leenụ ọbara! Ọ ga-abụ na ndị agha eze atọ ndị a etigbuola onwe ha. Pụtanụ, unu ndị Moab, ka anyị gaa kwakọrọ ihe nkwata na-agha!”