2 Ndị Eze 3

Ha tidara obodo ndị Moab niile, tinye nkume nʼala ubi ọma ndị Moab niile. Ha kpọchiri isi mmiri niile, gbudasịakwa ezi osisi niile na-amị mkpụrụ nʼala ahụ. Nʼikpeazụ, ọ bụ naanị otu obodo ndị Moab fọdụrụ, isi obodo a na-akpọ Kia Hareset. Ndị ji ụdọ na-ama nkume gbara obodo a gburugburu, bido ibuso ya agha.

2 Kings 3:25 (UKJV) And they beat down the cities, and on every good piece of land cast every man his stone, and filled it; and they stopped all the wells of water, and felled all the good trees: only in Kirharaseth left they the stones thereof; nevertheless the slingers went about it, and stroke it.

23Mgbe ahụ, ha sịrịtara onwe ha, “Leenụ ọbara! Ọ ga-abụ na ndị agha eze atọ ndị a etigbuola onwe ha. Pụtanụ, unu ndị Moab, ka anyị gaa kwakọrọ ihe nkwata na-agha!”

24Mgbe ha gbaara ọsọ bịaruo nʼụlọ agha ndị Izrel, ndị agha Izrel biliri malite itigbu ha. Ya mere, ndị agha Moab sitere nʼihu ha gbalaga. Ma ndị agha Izrel banyere nʼime obodo ndị Moab, gbuo ihe niile ha hụrụ nʼụzọ.

25Ha tidara obodo ndị Moab niile, tinye nkume nʼala ubi ọma ndị Moab niile. Ha kpọchiri isi mmiri niile, gbudasịakwa ezi osisi niile na-amị mkpụrụ nʼala ahụ. Nʼikpeazụ, ọ bụ naanị otu obodo ndị Moab fọdụrụ, isi obodo a na-akpọ Kia Hareset. Ndị ji ụdọ na-ama nkume gbara obodo a gburugburu, bido ibuso ya agha.

26Mgbe eze Moab hụrụ na agha ahụ anaghị agaziri ya nke ọma, ọ chịịrị narị ndị agha asaa, ndị ji mma agha ebu agha, gbalịa isi nʼetiti ndị agha Izrel tikapụta, na ncherita ihu ebe eze Edọm nọ, ma ha enweghị ike.

27Ya mere, o weere ọkpara ya, onye gaara abụ eze nʼọnọdụ ya, gbuo ya, dịka aja nʼelu mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu nye chi Moab. Iwe dị ukwuu dị nʼụbọchị ahụ megide Izrel. Ha kwụsịrị ibu agha, laghachi nʼobodo nke aka ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.