2 Ndị Eze 3

Mgbe ha gbaara ọsọ bịaruo nʼụlọ agha ndị Izrel, ndị agha Izrel biliri malite itigbu ha. Ya mere, ndị agha Moab sitere nʼihu ha gbalaga. Ma ndị agha Izrel banyere nʼime obodo ndị Moab, gbuo ihe niile ha hụrụ nʼụzọ.

2 Kings 3:24 (UKJV) And when they came to the camp of Israel, the Israelites rose up and stroke the Moabites, so that they fled before them: but they went forward smiting the Moabites, even in their country.

22Mgbe chi bọrọ nʼisi ụtụtụ, anyanwụ wara mụkwasị mmiri ahụ. Site nʼebe ha nọ, ndị Moab lepụrụ anya hụ mmiri ahụ ka ọ na-acha ọbara ọbara.

23Mgbe ahụ, ha sịrịtara onwe ha, “Leenụ ọbara! Ọ ga-abụ na ndị agha eze atọ ndị a etigbuola onwe ha. Pụtanụ, unu ndị Moab, ka anyị gaa kwakọrọ ihe nkwata na-agha!”

24Mgbe ha gbaara ọsọ bịaruo nʼụlọ agha ndị Izrel, ndị agha Izrel biliri malite itigbu ha. Ya mere, ndị agha Moab sitere nʼihu ha gbalaga. Ma ndị agha Izrel banyere nʼime obodo ndị Moab, gbuo ihe niile ha hụrụ nʼụzọ.

25Ha tidara obodo ndị Moab niile, tinye nkume nʼala ubi ọma ndị Moab niile. Ha kpọchiri isi mmiri niile, gbudasịakwa ezi osisi niile na-amị mkpụrụ nʼala ahụ. Nʼikpeazụ, ọ bụ naanị otu obodo ndị Moab fọdụrụ, isi obodo a na-akpọ Kia Hareset. Ndị ji ụdọ na-ama nkume gbara obodo a gburugburu, bido ibuso ya agha.

26Mgbe eze Moab hụrụ na agha ahụ anaghị agaziri ya nke ọma, ọ chịịrị narị ndị agha asaa, ndị ji mma agha ebu agha, gbalịa isi nʼetiti ndị agha Izrel tikapụta, na ncherita ihu ebe eze Edọm nọ, ma ha enweghị ike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.