2 Ndị Eze 3

O zigara Jehoshafat eze Juda ozi sị ya, “Eze Moab enupula isi megide m. Ị ga-abịa soro m ịga buso ndị Moab agha?” Ọ zaghachiri, “Aga m eso gị gaa. Mụ na gị bụ otu, ndị m bụ ndị gị, ịnyịnya m bụkwa ịnyịnya gị.”

2 Kings 3:7 (UKJV) And he went and sent to Jehoshaphat the king of Judah, saying, The king of Moab has rebelled against me: will you go with me against Moab to battle? And he said, I will go up: I am as you are, my people as your people, and my horses as your horses.

5Ma mgbe Ehab eze Izrel nwụrụ, eze Moab nupuru isi megide eze Izrel, jụkwa ịnọ nʼokpuru ya ọzọ.

6Ya mere, eze Joram sitere na Sameria pụọ ga kpọkọta ndị Izrel niile.

7O zigara Jehoshafat eze Juda ozi sị ya, “Eze Moab enupula isi megide m. Ị ga-abịa soro m ịga buso ndị Moab agha?” Ọ zaghachiri, “Aga m eso gị gaa. Mụ na gị bụ otu, ndị m bụ ndị gị, ịnyịnya m bụkwa ịnyịnya gị.”

8“Ma olee ụzọ anyị ga-esi gaa ibu agha ahụ?” Joram zara, “Anyị ga-esi ụzọ ọzara Edọm.”

9Ya mere, eze Izrel na eze Juda, na eze Edọm, na ndị agha ha niile, zukọtara site ụzọ ọzara Edọm ịga ibuso Moab agha. Ha gara ije abalị asaa nʼọzara. Ma mmiri ọṅụṅụ ha nwere gwụsịrị. Ọ dịkwaghị mmiri dịrị anụ ụlọ ha, na ndị agha ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.