2 Ndị Eze 4

Otu ụbọchị, otu nwanyị nʼime ndị inyom ndị amụma bịakwutere Ịlaisha rịọ ya sị, “Ohu gị, bụ di m anwụọla. Ị matara na ọ na-atụ egwu Onyenwe anyị. Ma ugbu a, onye o ji ụgwọ na-abịa ịkpọrọ ụmụ m ndị ikom abụọ ime ka ha bụrụ ndị ohu ya.”

2 Kings 4:1 (UKJV) Now there cried a certain woman of the wives of the sons of the prophets unto Elisha, saying, Your servant my husband is dead; and you know that your servant did fear the LORD: and the creditor has come to take unto him my two sons to be bondmen.

1Otu ụbọchị, otu nwanyị nʼime ndị inyom ndị amụma bịakwutere Ịlaisha rịọ ya sị, “Ohu gị, bụ di m anwụọla. Ị matara na ọ na-atụ egwu Onyenwe anyị. Ma ugbu a, onye o ji ụgwọ na-abịa ịkpọrọ ụmụ m ndị ikom abụọ ime ka ha bụrụ ndị ohu ya.”

2Ịlaisha jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere gị? Gwa m, gịnị ka i nwere nʼụlọ?” Nwanyị ahụ zara sị, “O nweghị ihe ọbụla ohu gị nwanyị nwere nʼụlọ karịa naanị ntakịrị mmanụ.”

3Ịlaisha sịrị, “Jegharịa na-ezi, gaa nata ndị agbataobi gị niile ite nke ihe ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha abụkwala ole na ole.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.