10Biko, ka anyị doziere ya otu ọnụụlọ nta nʼime ụlọ elu anyị, ka anyị tinyere ya ihe ndina na tebul, na oche, na oriọna, ka o nwee ebe ọ ga na-anọ mgbe ọbụla ọ bịakwutere anyị.”
11Otu ụbọchị, mgbe Ịlaisha bịakwara nʼebe ahụ, ọ bara nʼọnụụlọ ahụ, dinaa nʼebe ahụ.
12Ọ sịrị Gehazi onye na-ejere ya ozi, “Gaa kpọọ onye Shunem a,” Ya mere, ọ kpọrọ ya, ọ bịara guzo nʼihu ya,
13Ịlaisha gwara Gehazi, “Gwa nwanyị ahụ, sị, ‘Lee, otu i si enye onwe gị nsogbu niile ndị a maka anyị. Ugbu a, gịnị ka a ga-emere gị? Ọ bụ ka anyị gwa eze okwu banyere gị, ka ọ bụ ịgwa onyeisi ndị agha?’ ” Ọ zara, “Ebi m nʼetiti ndị m.”
14Ịlaisha jụrụ, “Gịnịkwa ka anyị ga-emere nwanyị a?” Gehazi sịrị, “Nʼezie, o nweghị nwa nwoke, di ya emeekwala agadi.”