2 Ndị Eze 4

Otu ụbọchị, mgbe Ịlaisha bịakwara nʼebe ahụ, ọ bara nʼọnụụlọ ahụ, dinaa nʼebe ahụ.

2 Kings 4:11 (UKJV) And it fell upon a certain day, that he came thither, and he turned into the chamber, and lay there.

9Ma nwanyị ahụ gwara di ya okwu sị, “O doro m anya nke ọma na nwoke a na-akwụsị nʼụlọ anyị mgbe niile bụ onye nsọ nke Chineke.

10Biko, ka anyị doziere ya otu ọnụụlọ nta nʼime ụlọ elu anyị, ka anyị tinyere ya ihe ndina na tebul, na oche, na oriọna, ka o nwee ebe ọ ga na-anọ mgbe ọbụla ọ bịakwutere anyị.”

11Otu ụbọchị, mgbe Ịlaisha bịakwara nʼebe ahụ, ọ bara nʼọnụụlọ ahụ, dinaa nʼebe ahụ.

12Ọ sịrị Gehazi onye na-ejere ya ozi, “Gaa kpọọ onye Shunem a,” Ya mere, ọ kpọrọ ya, ọ bịara guzo nʼihu ya,

13Ịlaisha gwara Gehazi, “Gwa nwanyị ahụ, sị, ‘Lee, otu i si enye onwe gị nsogbu niile ndị a maka anyị. Ugbu a, gịnị ka a ga-emere gị? Ọ bụ ka anyị gwa eze okwu banyere gị, ka ọ bụ ịgwa onyeisi ndị agha?’ ” Ọ zara, “Ebi m nʼetiti ndị m.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.