2 Ndị Eze 4

Ma nwanyị ahụ gwara di ya okwu sị, “O doro m anya nke ọma na nwoke a na-akwụsị nʼụlọ anyị mgbe niile bụ onye nsọ nke Chineke.

2 Kings 4:9 (UKJV) And she said unto her husband, Behold now, I perceive that this is an holy man of God, which passes by us continually.

7Ọ gara gwa onye nke Chineke ahụ, onye sịrị, “Gaa, ree mmanụ ahụ, kwụkwaa ụgwọ unu ji. Gị na ụmụ gị ndị ikom were nke fọdụrụ mee mkpa dịrị unu.”

8Otu ụbọchị, Ịlaisha gara nʼobodo Shunem. Otu nwanyị nwere ugwu bi nʼebe ahụ. Nwanyị ahụ rịọsiri ya ike ka o rie nri. Nʼihi ya, mgbe ọbụla Ịlaisha si nʼebe ahụ gafee, ọ na-akwụsị nʼebe ahụ rie ihe.

9Ma nwanyị ahụ gwara di ya okwu sị, “O doro m anya nke ọma na nwoke a na-akwụsị nʼụlọ anyị mgbe niile bụ onye nsọ nke Chineke.

10Biko, ka anyị doziere ya otu ọnụụlọ nta nʼime ụlọ elu anyị, ka anyị tinyere ya ihe ndina na tebul, na oche, na oriọna, ka o nwee ebe ọ ga na-anọ mgbe ọbụla ọ bịakwutere anyị.”

11Otu ụbọchị, mgbe Ịlaisha bịakwara nʼebe ahụ, ọ bara nʼọnụụlọ ahụ, dinaa nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.