14Ịlaisha jụrụ, “Gịnịkwa ka anyị ga-emere nwanyị a?” Gehazi sịrị, “Nʼezie, o nweghị nwa nwoke, di ya emeekwala agadi.”
15Ịlaisha sịrị, “Kpọọ ya.” Ya mere, Gehazi kpọrọ ya, ọ bịara guzo nʼọnụ ụzọ.
16Ịlaisha sịrị, “Na mgbe dị otu a nʼafọ ọzọ, ị ga-eku nwa nwoke nʼaka gị abụọ.” Ọ sịrị, “Mba, onyenwe m, biko, gị onye nke Chineke, agwala ohu gị nwanyị okwu ụgha.”
17Ma dịka Ịlaisha si kwuo, nwanyị ahụ tụụrụ ime, na mgbe ahụ nʼafọ ọzọ ya, ọ mụrụ nwa nwoke.
18Nwata ahụ toputara, otu ụbọchị ọ pụrụ jekwuru nna ya nʼubi, ebe ha nọ na-aghọ ọka.