16Ịlaisha sịrị, “Na mgbe dị otu a nʼafọ ọzọ, ị ga-eku nwa nwoke nʼaka gị abụọ.” Ọ sịrị, “Mba, onyenwe m, biko, gị onye nke Chineke, agwala ohu gị nwanyị okwu ụgha.”
17Ma dịka Ịlaisha si kwuo, nwanyị ahụ tụụrụ ime, na mgbe ahụ nʼafọ ọzọ ya, ọ mụrụ nwa nwoke.
18Nwata ahụ toputara, otu ụbọchị ọ pụrụ jekwuru nna ya nʼubi, ebe ha nọ na-aghọ ọka.
19O tikuru nna ya sị ya, “Isi m o, isi m o!” Nna ya sịrị otu nʼime ndị ohu ya, “Kuru ya kulaara nne ya.”
20O kuuru ya, kulaara ya nne ya, nwantakịrị nwoke ahụ nọdụrụ nʼapata nne ya ruo etiti ehihie, mgbe ọ nwụrụ.