2 Ndị Eze 4

Ịlaisha lọghachiri na Gilgal, mgbe ụnwụ dị nʼala ahụ. Otu ụbọchị, mgbe ya na ụfọdụ ndị amụma nọ na-enwe nzukọ, ọ gwara onye na-ejere ya ozi okwu sị ya: “Sikwasị ite ukwu ahụ nʼọkụ, siere ndị a mụ na ha nọ ihe oriri.”

2 Kings 4:38 (UKJV) And Elisha came again to Gilgal: and there was a dearth in the land; and the sons of the prophets were sitting before him: and he said unto his servant, Set on the great pot, and seethe pottage for the sons of the prophets.

36Ịlaisha kpọrọ Gehazi sị ya, “Kpọọ nwanyị Shunem.” Ya mere, ọ kpọrọ ya. Mgbe ọ bịakwutere ya, ọ sịrị, “Kuru nwa gị.”

37Ọ batara, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọ isiala. Emesịa, o kuuru nwa ya nwoke pụọ.

38Ịlaisha lọghachiri na Gilgal, mgbe ụnwụ dị nʼala ahụ. Otu ụbọchị, mgbe ya na ụfọdụ ndị amụma nọ na-enwe nzukọ, ọ gwara onye na-ejere ya ozi okwu sị ya: “Sikwasị ite ukwu ahụ nʼọkụ, siere ndị a mụ na ha nọ ihe oriri.”

39Otu onye nʼime ha pụrụ banye nʼọhịa ịchịkọta akwụkwọ nri. Ọ hụrụ osisi vaịnị toro nʼọhịa, chịkọtaa ụfọdụ afụfa ọhịa, nke o kpojuru nʼuwe mwụda ya dịka ọ ga-ejideli. Mgbe ọ lọghachiri, o gbupịasịrị afụfa ọhịa ndị a, wụnye ha nʼime ite ahụ si nʼọkụ, ọ bụ ezie na o nweghị onye maara ihe ha bụ.

40Mgbe o ghere, a wụpụtara ya nye ndị ikom ndị ahụ. Ma mgbe ha bidoro iri ya, ha tiri mkpu akwa sị, “Onye nke Chineke, lee, ọnwụ dị nʼite nri a.” Ha enwekwaghị ike iri ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.