2 Ndị Eze 5

Ma ka Onyenwe anyị gbaghara ohu gị naanị otu ihe a. Mgbe nna m ukwu banyere nʼụlọ arụsị Rimọn ịkpọ isiala, mgbe ọ na-adabere nʼaka m, nke ga-eme ka mụ onwe m kpọọkwa isiala. Mgbe m si otu a kpọọ isiala nʼụlọ arụsị Rimọn, ka Onyenwe anyị gbaghara ohu gị nʼihi nke a.”

2 Kings 5:18 (UKJV) In this thing the LORD pardon your servant, that when my master goes into the house of Rimmon to worship there, and he leans on my hand, and I bow myself in the house of Rimmon: when I bow down myself in the house of Rimmon, the LORD pardon your servant in this thing.

16Ma Ịlaisha zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye m na-ejere ozi, agaghị m ana gị ihe ọbụla.” Ma Neeman rịọrọ ya arịrịọ ka ọ nara ya, ma ọ jụrụ ajụ.

17Mgbe ahụ Neeman sịrị, “Ọ bụrụ na ị gaghị anara, biko, kwerenụ ka m kporo aja nke ịnyịnya abụọ nwere ike ibu. Nʼihi na site ugbu a gaa nʼihu, agaghị m achụrụ chi ọzọ aja nsure ọkụ, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị.

18Ma ka Onyenwe anyị gbaghara ohu gị naanị otu ihe a. Mgbe nna m ukwu banyere nʼụlọ arụsị Rimọn ịkpọ isiala, mgbe ọ na-adabere nʼaka m, nke ga-eme ka mụ onwe m kpọọkwa isiala. Mgbe m si otu a kpọọ isiala nʼụlọ arụsị Rimọn, ka Onyenwe anyị gbaghara ohu gị nʼihi nke a.”

19Ịlaisha zara sị ya, “Ọ dị mma, laa nʼudo.” Mgbe Neeman lawara, o jerubeghị ebe dị anya,

20Gehazi, bụ onyeozi Ịlaisha onye nke Chineke, sịrị nʼobi ya, “Nna m ukwu emezighị ikwere ka Neeman onye Aram laa na-anataghị ya ihe o ji bịa. Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m eji ọsọ gbakwuru ya napụta ya ụfọdụ ihe ahụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.