25Mgbe ọ batara nʼụlọ guzo nʼihu nna ya ukwu, Ịlaisha jụrụ ya sị, “Ebee ka i si na-abịa Gehazi?” Ọ zara, “Ohu gị ejeghị ebe ọbụla.”
26Mgbe ahụ Ịlaisha zara ya, “Ọ bụ na mmụọ m esoghị gị mgbe nwoke ahụ si nʼụgbọ ya rịdata izute gị? Oge a ọ bụ oge ịnara ego, na ịnara uwe, na ịnara ubi oliv, na ubi vaịnị, na igwe ehi, na igwe atụrụ, na ndị ohu ndị ikom, na ndị ohu ndị inyom na-eje ozi?
27Nʼihi nke a, ekpenta ahụ dị Neeman ga-abịakwasị gị, na ụmụ ụmụ gị, ruo mgbe ebighị ebi.” Ya mere, Gehazi ghọrọ onye ekpenta si nʼihu ya pụọ. Anụ ahụ ya bidokwara ịcha ọcha dịka ogho ọcha.