20Mgbe ha bịaruru Sameria, Ịlaisha kpere ekpere sị, “Biko, Onyenwe anyị, ugbu a meghee anya ha, ka ha hụ ụzọ.” Onyenwe anyị meghere anya ha dịka Ịlaisha kpere nʼekpere; ha matakwara na ha nọ na Sameria.
21Mgbe eze Izrel hụrụ ha, ọ jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Nna m, ị chọrọ ka m gbuo ha?”
22Ịlaisha zara sị ya, “Egbula ha. Ị ga-egbu ndị i ji mma agha na ụta gị dọta nʼagha? Nye ha nri na mmiri, zilaga ha ka ha lakwuru onyenwe ha.”
23Ya mere, ọ kwadooro ha oke oriri dị ukwuu, mgbe ha riri, ṅụkwaa, o zilagara ha, ha lakwuuru nna ha ukwu. Site nʼoge ahụ gaa nʼihu, ndị otu Aram na-apụnara mmadụ ihe kwusịrị inye nsogbu nʼoke ala ndị Izrel.
24Ma mgbe ụfọdụ oge gasịrị, Ben-Hadad, eze Aram, chịkọtara ndị agha ya niile pụta bịa gbaa Sameria gburugburu.