2 Ndị Eze 6

Ọ sịrị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na isi Ịlaisha nwa Shafat anọgide nʼahụ ya taa.”

2 Kings 6:31 (UKJV) Then he said, God do so and more also to me, if the head of Elisha the son of Shaphat shall stand on him this day.

29Ya mere, na anyị siri nwa m rie ya. Nʼụbọchị nke so ya asịrị m ya, ‘Wepụta nwa gị nwoke ka anyị rie ya,’ ma o zoola ya.”

30Mgbe eze nụrụ okwu nwanyị a, ọ dọwara uwe ya. Ma dịka ọ na-agabiga nʼelu mgbidi ahụ, ndị mmadụ lere anya hụ nʼokpuru uwe, akwa mkpe dị nʼime ahụ ya.

31Ọ sịrị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na isi Ịlaisha nwa Shafat anọgide nʼahụ ya taa.”

32Nʼoge a, Ịlaisha nọdụrụ ala nʼụlọ ya, ndị okenye sokwa ya nọdụ. Eze zipụrụ onyeozi, ma tupu o rute, Ịlaisha gwara ndị okenye ahụ okwu sị ha, “Unu ahụla na ogbu mmadụ a ezitela mmadụ ka ọ bịa gbupụ m isi. Mgbe onyeozi ya bịaruru, mechienụ ụzọ hapụ ya nʼezi, nʼihi na eze nʼonwe ya ga-eso ya nʼazụ bịa.”

33Mgbe Ịlaisha nọ na-agwa ha okwu, lee onyeozi ahụ ka ọ na-abịakwute ya. Eze sokwa ya nʼazụ na-ekwu okwu na-asị, “Onyenwe anyị emeela ka ihe ọjọọ dị otu a dakwasị anyị. Gịnị mere m ga-eji lee anya inyeaka site nʼaka Onyenwe anyị ọzọ?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.