27Ma eze zara sị ya, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekweghị inyere gị aka, ebee ka m ga-esi nwetara gị inyeaka? Ọ bụ site nʼebe ịzọcha ọka? Ka ọ bụ nʼebe ịzọcha mmanya vaịnị?”
28Mgbe ahụ, eze jụrụ ya sị, “Gịnị na-eme?” Ọ zara, “Nwanyị a sịrị, ‘Nye nwa gị nwoke ka anyị rie ya taa, echi anyị ga-eri nwa m nwoke.’
29Ya mere, na anyị siri nwa m rie ya. Nʼụbọchị nke so ya asịrị m ya, ‘Wepụta nwa gị nwoke ka anyị rie ya,’ ma o zoola ya.”
30Mgbe eze nụrụ okwu nwanyị a, ọ dọwara uwe ya. Ma dịka ọ na-agabiga nʼelu mgbidi ahụ, ndị mmadụ lere anya hụ nʼokpuru uwe, akwa mkpe dị nʼime ahụ ya.
31Ọ sịrị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na isi Ịlaisha nwa Shafat anọgide nʼahụ ya taa.”