5Ma mgbe otu nʼime ha nọ na-egbutu otu osisi, anyụike ya dabara nʼime mmiri. O tiri mkpu sị, “Ewoo, onyenwe m. Ọ bụkwanụ ihe a rịọtara arịọta.”
6Mgbe ahụ, onye nke Chineke jụrụ ya sị, “Ebee ka ọ dabara?” Mgbe o ziri ya ebe ọ dabara, Ịlaisha gbutere osisi tụba ya nʼebe ahụ, mee ka anyụike ahụ segolite na-erugharị nʼelu mmiri.
7Ọ sịrị, “Tụtụlite ya.” O setịrị aka ya wepụta ya.
8Nʼoge a, eze ndị Aram na ndị Izrel nọ nʼagha. Mgbe ya na ndịisi agha ya kparịtachara, ọ sịrị, “Aga m eguzobe ọmụma ụlọ ikwu m nʼebe dị otu a na nʼebe dị otu a.”
9Ngwangwa, onye nke Chineke zigaara eze Izrel ozi sị, “Lezie anya, unu ejekwala nso nʼebe ahụ, nʼihi na eze Aram na ndị agha ya nọ nʼebe ahụ.”