2 Ndị Eze 7

Ịlaisha zara sị ya, “Nụrụ okwu Onyenwe anyị. Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Nʼoge dịka mgbe a echi, a ga-ere otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, rekwaa akpa nta ọka balị abụọ otu shekel nʼọnụ ụzọ ama obodo Sameria.”

2 Kings 7:1 (UKJV) Then Elisha said, Hear all of you the word of the LORD; Thus says the LORD, Tomorrow about this time shall a measure of fine flour be sold for a shekel, and two measures of barley for a shekel, in the gate of Samaria.

1Ịlaisha zara sị ya, “Nụrụ okwu Onyenwe anyị. Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Nʼoge dịka mgbe a echi, a ga-ere otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, rekwaa akpa nta ọka balị abụọ otu shekel nʼọnụ ụzọ ama obodo Sameria.”

2Ọchịagha ahụ, nke eze na-adabere nʼaka ya, sịrị onye nke Chineke, “Lee, a sịkwarị na Onyenwe anyị emeghee oghere idee nke eluigwe, nke a ọ pụrụ ime?” Ma Ịlaisha zara ya, “Ị ga-eji anya gị abụọ hụ ya, ma ị gaghị eri site nʼime ya.”

3Nʼoge a, e nwere ndị ekpenta anọ nọ nʼezi mgbidi gbara Sameria gburugburu, nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka anyị nọ nʼebe a na-eme? Ọ bụ ka anyị nọrọ nʼebe a tutu anyị anwụọ?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.