2 Ndị Eze 7

Ma otu onye nʼime ndịisi agha ya zara sị ya, “Ka ụfọdụ mmadụ duru ịnyịnya ise ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo. Ọ bụrụ na ndị a alọtaghị ọnọdụ ha ga-adị ka nke ndị Izrel niile fọdụrụ nʼebe, e, ha ga-adị ka ndị Izrel niile a gụrụ dịka ndị nwụrụ anwụ. Ya mere, ka anyị zipụ ha ka ha gaa chọpụta ihe mere.”

2 Kings 7:13 (UKJV) And one of his servants answered and said, Let some take, I pray you, five of the horses that remain, which are left in the city, (behold, they are as all the multitude of Israel that are left in it: behold, I say, they are even as all the multitude of the Israelites that are consumed:) and let us send and see.

11Ndị na-eche nche tiri mkpu kọọrọ ndị nọ nʼụlọeze ihe mere.

12Eze biliri nʼabalị ahụ gwa ndịisi ọrụ ya sị, “Ka m gwa unu ihe ndị Aram mere anyị. Ha maara na anyị nọ nʼoke agụụ, nʼihi ya, ha akpacharala anya hapụ ọmụma ụlọ ikwu ha gaa zoo onwe ha nʼime ọhịa. Echiche ha bụ, ‘Ndị a ga-apụtarịrị, mgbe ahụ, anyị ga-ejide ha na ndụ, banyekwa nʼime obodo ha.’ ”

13Ma otu onye nʼime ndịisi agha ya zara sị ya, “Ka ụfọdụ mmadụ duru ịnyịnya ise ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo. Ọ bụrụ na ndị a alọtaghị ọnọdụ ha ga-adị ka nke ndị Izrel niile fọdụrụ nʼebe, e, ha ga-adị ka ndị Izrel niile a gụrụ dịka ndị nwụrụ anwụ. Ya mere, ka anyị zipụ ha ka ha gaa chọpụta ihe mere.”

14Ya mere, ha họpụtara ụgbọ agha abụọ na ịnyịnya ndị na-adọkpụ ha. Eze zipụrụ ha ịchụso ndị agha Aram, O nyere ndị na-agba ha iwu sị, “Gaanụ chọpụta ihe mere.”

15Ha sogidere ha ruo nʼosimiri Jọdan. Nʼakụkụ ụzọ niile jupụtara nʼuwe na ngwa agha ndị agha Aram tufuru mgbe ha na-eme ngwangwa. Ndị ahụ e zipụrụ lọghachiri bịa kọọrọ eze ihe ha hụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.