13Ma otu onye nʼime ndịisi agha ya zara sị ya, “Ka ụfọdụ mmadụ duru ịnyịnya ise ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo. Ọ bụrụ na ndị a alọtaghị ọnọdụ ha ga-adị ka nke ndị Izrel niile fọdụrụ nʼebe, e, ha ga-adị ka ndị Izrel niile a gụrụ dịka ndị nwụrụ anwụ. Ya mere, ka anyị zipụ ha ka ha gaa chọpụta ihe mere.”
14Ya mere, ha họpụtara ụgbọ agha abụọ na ịnyịnya ndị na-adọkpụ ha. Eze zipụrụ ha ịchụso ndị agha Aram, O nyere ndị na-agba ha iwu sị, “Gaanụ chọpụta ihe mere.”
15Ha sogidere ha ruo nʼosimiri Jọdan. Nʼakụkụ ụzọ niile jupụtara nʼuwe na ngwa agha ndị agha Aram tufuru mgbe ha na-eme ngwangwa. Ndị ahụ e zipụrụ lọghachiri bịa kọọrọ eze ihe ha hụrụ.
16Ndị Izrel niile pụrụ gaa kwakọrọ ihe dị nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Aram. Nke bụ na e rere otu akpa nta ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma otu shekel, rekwaa akpa ọka balị abụọ otu shekel dịka Onyenwe anyị si kwuo.
17Eze họpụtara ọchịagha ahụ, nke ọ na-adabere nʼaka ya, nye ya ọrụ ilekọta ọnụ ụzọ obodo ahụ. Ma ndị si nʼobodo na-enupụta nuturu ya, zọọ ya ụkwụ, zọgbuo ya mgbe ha na-agbapụta. Ọ nwụrụ dịka Ịlaisha onye nke Chineke kwuru mgbe eze bịakwutere ya ụnyaahụ, ijide ya.