2Ọchịagha ahụ, nke eze na-adabere nʼaka ya, sịrị onye nke Chineke, “Lee, a sịkwarị na Onyenwe anyị emeghee oghere idee nke eluigwe, nke a ọ pụrụ ime?” Ma Ịlaisha zara ya, “Ị ga-eji anya gị abụọ hụ ya, ma ị gaghị eri site nʼime ya.”
3Nʼoge a, e nwere ndị ekpenta anọ nọ nʼezi mgbidi gbara Sameria gburugburu, nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka anyị nọ nʼebe a na-eme? Ọ bụ ka anyị nọrọ nʼebe a tutu anyị anwụọ?
4Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Anyị ga-abanye nʼime obodo,’ ụnwụ dị nʼebe ahụ, anyị ga-anwụkwa. Ọ bụrụkwanụ na anyị anọgide nʼebe a anyị ga-anwụ. Ya mere ka anyị gafeenụ banye nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram, were onwe anyị nyefee ha nʼaka. Ọ bụrụ na ha edebe anyị ndụ, anyị ga-adị ndụ, ọ bụrụ na ha egbuo anyị, anyị ga-anwụkwa.”
5Nʼoge uhuruchi, ha biliri gaa nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram. Mgbe ha bịarutere nʼọnụ ụlọ ikwu ahụ, o nwekwaghị onye nọ nʼebe ahụ,
6nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ndị Aram nụ ụzụ ụgbọ agha na nke ịnyịnya, na nke usuu ndị agha. Nke a mere ka onye ọbụla gwa ibe ya sị, “Lee, eze ndị Izrel egoola ndị agha ndị Het, na ndị eze Ijipt ibuso anyị agha.”