2 Ndị Eze 8

Mgbe Ịlaisha nọ na-ekwu okwu a, o legidere Hazael anya nʼihu tutu ruo mgbe ihere mere ya. Mgbe ahụ, onye nke Chineke kwara akwa.

2 Kings 8:11 (UKJV) And he settled his countenance steadfastly, until he was ashamed: and the man of God wept.

9Hazael weere iri ịnyịnya kamel anọ buru ezi ihe niile si nʼala Damaskọs, wetara Ịlaisha onyinye ndị a sị ya, “Nwa gị Ben-Hadad, eze Aram, zitere ka m jụọ gị sị, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’ ”

10Ịlaisha zara sị ya, “Laa, gaa gwa ya sị ya, ‘Ị ga-esi nʼọrịa bilie.’ Ma Onyenwe anyị egosila m na, nʼezie, ọ ga-anwụ.”

11Mgbe Ịlaisha nọ na-ekwu okwu a, o legidere Hazael anya nʼihu tutu ruo mgbe ihere mere ya. Mgbe ahụ, onye nke Chineke kwara akwa.

12Mgbe ahụ, Hazael jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Ọ bụ gịnị mere onyenwe m ji akwa akwa?” Ịlaisha zara sị ya, “Nʼihi na amaara m ihe ọjọọ ị ga-eme ụmụ Izrel nʼoge dị nʼihu. Ị ga-akpọ obodo niile ha e wusiri ike ọkụ, jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha. Ị ga-atụpịa ụmụntakịrị na-aṅụ ara, bọwakwaa afọ ndị inyom dị ime.”

13Hazael sịrị, “Olee otu ọrụ gị, bụ nkịta efu, ga-esi nwee ike imezu ihe ukwuu a?” Ịlaisha zara, “Onyenwe anyị egosila m na ị ga-abụ eze Aram.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.