2 Ndị Eze 8

Mgbe Hazael, si nʼebe Ịlaisha nọ laa, ọ bịakwutere nna ya ukwu. Mgbe Ben-Hadad jụrụ ya sị, “Gịnị ka Ịlaisha gwara gị?” Hazael zara sị, “Ọ gwara m na ị ga-esi nʼọrịa bilie.”

2 Kings 8:14 (UKJV) So he departed from Elisha, and came to his master; who said to him, What said Elisha to you? And he answered, He told me that you should surely recover.

12Mgbe ahụ, Hazael jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Ọ bụ gịnị mere onyenwe m ji akwa akwa?” Ịlaisha zara sị ya, “Nʼihi na amaara m ihe ọjọọ ị ga-eme ụmụ Izrel nʼoge dị nʼihu. Ị ga-akpọ obodo niile ha e wusiri ike ọkụ, jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha. Ị ga-atụpịa ụmụntakịrị na-aṅụ ara, bọwakwaa afọ ndị inyom dị ime.”

13Hazael sịrị, “Olee otu ọrụ gị, bụ nkịta efu, ga-esi nwee ike imezu ihe ukwuu a?” Ịlaisha zara, “Onyenwe anyị egosila m na ị ga-abụ eze Aram.”

14Mgbe Hazael, si nʼebe Ịlaisha nọ laa, ọ bịakwutere nna ya ukwu. Mgbe Ben-Hadad jụrụ ya sị, “Gịnị ka Ịlaisha gwara gị?” Hazael zara sị, “Ọ gwara m na ị ga-esi nʼọrịa bilie.”

15Ma nʼechi ya, Hazael chịịrị akwa na-egbo oyi, banye ya na mmiri jiri ya baa nʼebe eze dina, gbasaa ya nʼihu eze, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ. Emesịa, Hazael ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

16Nʼafọ nke ise nke ọchịchị Joram nwa Ehab eze Izrel, mgbe Jehoshafat bụ eze Juda, ka Jehoram nwa Jehoshafat malitere ọchịchị ya dịka eze Juda.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.