1Ịlaisha gwara nwanyị ahụ o mere ka nwa ya si nʼọnwụ bilie okwu sị ya, “Bilie, gị na ezinaụlọ gị, gaa nʼobodo ọzọ ebe unu ga-anọ dịka ọbịa nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola na oke ụnwụ ga-adakwasị ala Izrel afọ asaa.”
2Nwanyị ahụ mere dịka onye nke Chineke gwara ya, o biliri, ya na ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Filistia afọ asaa.
3Mgbe ụnwụ ahụ gwụsịrị nʼafọ nke asaa, o si nʼala ndị Filistia lọta nʼIzrel. Mgbe ọ lọtara, o jekwuuru eze ka o nyere ya aka inwetaghachi ụlọ ya na ala ya.
4Mgbe nwanyị ahụ bịakwutere eze, eze nọ na-agwa Gehazi bụ onye na-ejere onye nke Chineke ozi okwu sị ya, “Biko, kọọrọ m akụkọ ihe ukwu niile Ịlaisha mere.”
5Mgbe Gehazi na-akọrọ eze otu Ịlaisha si mee ka nwantakịrị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ, nwanyị ahụ, onye bụ nne nwantakịrị ahụ, batara nʼime ụlọeze. Mgbe ahụ, Gehazi kwuru sị, “Onyenwe m eze, onye a bụ nwanyị ahụ, leekwa nwa ya nwoke, onye Ịlaisha mere ka ọ dị ndụ ọzọ.”