2 Ndị Eze 8

Mgbe nwanyị ahụ bịakwutere eze, eze nọ na-agwa Gehazi bụ onye na-ejere onye nke Chineke ozi okwu sị ya, “Biko, kọọrọ m akụkọ ihe ukwu niile Ịlaisha mere.”

2 Kings 8:4 (UKJV) And the king talked with Gehazi the servant of the man of God, saying, Tell me, I pray you, all the great things that Elisha has done.

2Nwanyị ahụ mere dịka onye nke Chineke gwara ya, o biliri, ya na ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Filistia afọ asaa.

3Mgbe ụnwụ ahụ gwụsịrị nʼafọ nke asaa, o si nʼala ndị Filistia lọta nʼIzrel. Mgbe ọ lọtara, o jekwuuru eze ka o nyere ya aka inwetaghachi ụlọ ya na ala ya.

4Mgbe nwanyị ahụ bịakwutere eze, eze nọ na-agwa Gehazi bụ onye na-ejere onye nke Chineke ozi okwu sị ya, “Biko, kọọrọ m akụkọ ihe ukwu niile Ịlaisha mere.”

5Mgbe Gehazi na-akọrọ eze otu Ịlaisha si mee ka nwantakịrị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ, nwanyị ahụ, onye bụ nne nwantakịrị ahụ, batara nʼime ụlọeze. Mgbe ahụ, Gehazi kwuru sị, “Onyenwe m eze, onye a bụ nwanyị ahụ, leekwa nwa ya nwoke, onye Ịlaisha mere ka ọ dị ndụ ọzọ.”

6Eze jụrụ nwanyị ahụ ajụjụ sị ya, “Ọ bụ eziokwu?” Nwanyị ahụ kọọrọ eze akụkọ ihe niile mere. Mgbe ahụ, eze dunyere ya otu onyeisi nʼime ndị ozi ya ka o nyere ya aka inwetaghachi ihe ya niile, ya na ụgwọ ruru ya nʼihi mkpụrụ ubi ya niile ha ghọrọ mgbe ahụ o bi nʼala ndị Filistia.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.