11Jehu jekwuuru ndịisi agha ibe ya. Otu onye nʼime ha jụrụ ya sị, “Gịnị ka onye ara ahụ chọrọ bịa? Udo ọ dịkwa?” Jehu zara, “Unu maara onye ọ bụ, marakwa ụdị okwu ga-esi ya nʼọnụ pụta.”
12Ha sịrị, “Ihe i kwuru abụghị eziokwu, gwa anyị ihe o kwuru.” Jehu sịrị, “Ihe ndị a ka ọ gwara m, ‘Otu a ka a Onyenwe anyị kwuru, Eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ ”
13Ngwangwa ha chịịrị uwe mgbokwasị ha niile doo ha nʼusoro nʼala ebe ahụ ka Jehu zọkwasị ha ụkwụ. Ha fụrụ opi ike tie mkpu sị, “Jehu bụ eze!”
14Otu a ka Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi, si gbaa izu megide Joram. (Nʼoge a, Joram na ndị Izrel niile na-eche Ramọt Gilead nche, nʼihi Hazael eze Aram.)
15Ma Joram bụ eze, laghachitere na Jezril ebe ọ nọ ka ahụ dị ya mma maka ahụ ndị Aram merụrụ ya mgbe ya na Hazael, eze Aram lụrụ agha. Ya mere, Jehu sịrị, “Ọ bụrụ na nke a bụ uche unu, ime m eze unu, unu ekwela ka onye ọbụla si nʼobodo a gbapụ, gaa Jezril kọọ akụkọ a.”