2 Ndị Eze 9

Otu a ka Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi, si gbaa izu megide Joram. (Nʼoge a, Joram na ndị Izrel niile na-eche Ramọt Gilead nche, nʼihi Hazael eze Aram.)

2 Kings 9:14 (UKJV) So Jehu the son of Jehoshaphat the son of Nimshi conspired against Joram. (Now Joram had kept Ramothgilead, he and all Israel, because of Hazael king of Syria.

12Ha sịrị, “Ihe i kwuru abụghị eziokwu, gwa anyị ihe o kwuru.” Jehu sịrị, “Ihe ndị a ka ọ gwara m, ‘Otu a ka a Onyenwe anyị kwuru, Eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ ”

13Ngwangwa ha chịịrị uwe mgbokwasị ha niile doo ha nʼusoro nʼala ebe ahụ ka Jehu zọkwasị ha ụkwụ. Ha fụrụ opi ike tie mkpu sị, “Jehu bụ eze!”

14Otu a ka Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi, si gbaa izu megide Joram. (Nʼoge a, Joram na ndị Izrel niile na-eche Ramọt Gilead nche, nʼihi Hazael eze Aram.)

15Ma Joram bụ eze, laghachitere na Jezril ebe ọ nọ ka ahụ dị ya mma maka ahụ ndị Aram merụrụ ya mgbe ya na Hazael, eze Aram lụrụ agha. Ya mere, Jehu sịrị, “Ọ bụrụ na nke a bụ uche unu, ime m eze unu, unu ekwela ka onye ọbụla si nʼobodo a gbapụ, gaa Jezril kọọ akụkọ a.”

16Mgbe ahụ, Jehu wụkwasịrị nʼelu ụgbọ agha ya gbaga Jezril, nʼihi na Joram nọ nʼebe ahụ na-ezu ike. Ma Ahazaya, bụ eze Juda gakwara ileta ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.