2 Ndị Eze 9

Mgbe ahụ, Jehu wụkwasịrị nʼelu ụgbọ agha ya gbaga Jezril, nʼihi na Joram nọ nʼebe ahụ na-ezu ike. Ma Ahazaya, bụ eze Juda gakwara ileta ya.

2 Kings 9:16 (UKJV) So Jehu rode in a chariot, and went to Jezreel; for Joram lay there. And Ahaziah king of Judah was come down to see Joram.

14Otu a ka Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi, si gbaa izu megide Joram. (Nʼoge a, Joram na ndị Izrel niile na-eche Ramọt Gilead nche, nʼihi Hazael eze Aram.)

15Ma Joram bụ eze, laghachitere na Jezril ebe ọ nọ ka ahụ dị ya mma maka ahụ ndị Aram merụrụ ya mgbe ya na Hazael, eze Aram lụrụ agha. Ya mere, Jehu sịrị, “Ọ bụrụ na nke a bụ uche unu, ime m eze unu, unu ekwela ka onye ọbụla si nʼobodo a gbapụ, gaa Jezril kọọ akụkọ a.”

16Mgbe ahụ, Jehu wụkwasịrị nʼelu ụgbọ agha ya gbaga Jezril, nʼihi na Joram nọ nʼebe ahụ na-ezu ike. Ma Ahazaya, bụ eze Juda gakwara ileta ya.

17Mgbe onye nche nọ nʼụlọ elu Jezril hụrụ Jehu na ndị agha ya ka ha na-abịa, o tiri mkpu sị, “Lee, o nwere ndị agha na-abịa.” Joram eze Izrel nyere iwu sị, “Zipụ otu onye na-agba ịnyịnya ka ọ gaa zute ha jụọ ha sị, ‘Udo ọ dịkwa?’ ”

18Onye ọgbaịnyịnya ahụ nọkwasịrị nʼelu ya gbapụ izute Jehu, sị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’ ” Jehu zara, “Gịnị ka gị na udo nwekọrọ? Tụgharịa gaa soro m nʼazụ.” Onye nche ahụ ziri ozi sị, “Onyeozi ahụ ezutela ha, kama ọ naghị alọta.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.