2 Ndị Eze 9

Eze zipụrụ onye ọgbaịnyịnya nke abụọ. Mgbe ọ bịakwutere ha ọ sịrị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’ ” Jehu zara, “Gịnị ka gị na udo nwekọrọ? Chigharịa soro m nʼazụ.”

2 Kings 9:19 (UKJV) Then he sent out a second on horseback, which came to them, and said, Thus says the king, Is it peace? And Jehu answered, What have you to do with peace? turn you behind me.

17Mgbe onye nche nọ nʼụlọ elu Jezril hụrụ Jehu na ndị agha ya ka ha na-abịa, o tiri mkpu sị, “Lee, o nwere ndị agha na-abịa.” Joram eze Izrel nyere iwu sị, “Zipụ otu onye na-agba ịnyịnya ka ọ gaa zute ha jụọ ha sị, ‘Udo ọ dịkwa?’ ”

18Onye ọgbaịnyịnya ahụ nọkwasịrị nʼelu ya gbapụ izute Jehu, sị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’ ” Jehu zara, “Gịnị ka gị na udo nwekọrọ? Tụgharịa gaa soro m nʼazụ.” Onye nche ahụ ziri ozi sị, “Onyeozi ahụ ezutela ha, kama ọ naghị alọta.”

19Eze zipụrụ onye ọgbaịnyịnya nke abụọ. Mgbe ọ bịakwutere ha ọ sịrị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’ ” Jehu zara, “Gịnị ka gị na udo nwekọrọ? Chigharịa soro m nʼazụ.”

20Onye ahụ nọ na-eche nche sịrị, “Ọ garuola ha nso, ma ọ dịghị alọghachitekwa azụ. Ma ọgbụgba ịnyịnya dịka ọ bụ Jehu nwa Nimshi, nʼihi na ọ na-agba ịnyịnya ya dịka onye na-ayị ara.”

21Joram nyere iwu sị, “Kwadooro m ụgbọ agha m.” Mgbe a kwadooro ya, Joram eze Izrel, na Ahazaya, eze Juda, pụtara nọkwasị nʼụgbọ agha, onye ọbụla na nke ya, pụọ ịga izute Jehu. Ha zutere ya nʼoke ala ubi Nebọt, onye Jezril.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.