1Emesịa, Ịlaisha onye amụma, kpọrọ otu onye nʼime ụmụ ndị amụma sị ya, “Jikere, fanye ọnụ uwe mwụda gị nʼeriri ikere nʼukwu gị, werekwa karama mmanụ oliv a nʼaka gị, bịa ka ị gaa Ramọt Gilead.
2I jeruo ebe ahụ, jee hụ Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi anya. Mee ka o bilie site nʼetiti ndị ha na ya nọ. Mekwaa ka gị na ya naanị baa nʼime ụlọ.
3Were karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi gwa ya okwu sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ I mesịa, meghe ụzọ ọsịịsọ, sitekwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ.”
4Nwokorobịa onye amụma ahụ gara Ramọt Gilead.