4Nwokorobịa onye amụma ahụ gara Ramọt Gilead.
5Mgbe o jeruru, ọ hụrụ ebe ọchịagha ahụ nọdụrụ nʼala nʼetiti ndịisi agha ibe ya. O kwuru sị, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ọchịagha.” Jehu jụrụ, “Ọ bụ onye nʼime anyị ka ị chọrọ izi ozi?” Ọ zara, “Ọ bụ gị ọchịagha.”
6Jehu biliri baa nʼime ụlọ. Nwokorobịa onye amụma ahụ wụkwasịrị ya mmanụ nʼisi, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Eteela m gị mmanụ ịbụ eze ndị nke Onyenwe anyị, bụ Izrel.
7Ị ga-ekpochapụ ezinaụlọ Ehab, nna gị ukwu, aga m esi otu a bọtara onwe m ọbọ, nʼihi ọbara ndị ohu m, bụ ndị amụma na ọbara ndị ozi Onyenwe anyị niile Jezebel wufuru.
8Ezinaụlọ Ehab ga-abụ ihe lara nʼiyi. Nʼala Izrel, m ga-esite nʼezinaụlọ Ehab bipụ ndị ikom niile, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya.