9Ma onye ọbụla na-atụkwasịghị ihe ndị a nʼokwukwe ya nọ nʼọchịchịrị. Ọ naghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa onye na-echefu na a sachapụla ya mmehie ya, ndị o mere nʼoge gara aga.
10Nʼihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike iguzosike nʼọkpụkpọ na nhọpụta unu. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsọ ngọngọ maọbụ daa.
11Nʼụzọ dị otu a, a ga-enye unu ohere dị ukwuu iji bata nʼalaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst.
12Aga m na-aga nʼihu na-echetara unu ihe ndị a site nʼoge ruo nʼoge. Ọ bụ ezie na unu maara na ha na-eguzosikwa ike nʼeziokwu ahụ unu natara.
13Ana m agụ ya nʼihe ziri ezi ịkpọte mmụọ unu na uche unu site nʼichetara unu ihe ndị a ugbu a m dị ndụ nʼanụ ahụ a.