2 Pita 1

Ma onye ọbụla na-atụkwasịghị ihe ndị a nʼokwukwe ya nọ nʼọchịchịrị. Ọ naghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa onye na-echefu na a sachapụla ya mmehie ya, ndị o mere nʼoge gara aga.

2 Peter 1:9 (UKJV) But he that lacks these things is blind, and cannot see far off, and has forgotten that he was purged from his old sins.

7Tụkwasịkwanụ obiọma nye ụmụnna nʼelu ibi ndụ dị ka ndị Chineke, ma na-atụkwasịkwanụ ịhụnanya nʼelu obiọma nye ụmụnna.

8Ọ bụrụ na unu enwe ihe ndị a nʼụzọ ha jubigakwara oke nʼime unu, mgbe ahụ ha ga-eme ka unu ndị na-adịghị amị mkpụrụ, bụrụ ndị na-amị mkpụrụ, na ndị bara uru nʼihe unu maara banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

9Ma onye ọbụla na-atụkwasịghị ihe ndị a nʼokwukwe ya nọ nʼọchịchịrị. Ọ naghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa onye na-echefu na a sachapụla ya mmehie ya, ndị o mere nʼoge gara aga.

10Nʼihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike iguzosike nʼọkpụkpọ na nhọpụta unu. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsọ ngọngọ maọbụ daa.

11Nʼụzọ dị otu a, a ga-enye unu ohere dị ukwuu iji bata nʼalaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.